33 A ga-emepụ ya ọnyá, mechuo ya ihu,+
Ihere agaghịkwa akwụsị ime ya.+
34 N’ihi na ekworo na-eme ka iwe ju nwoke lụrụ nwaanyị obi.
Ọ gaghịkwa eme ebere ma ọ bọwa ọbọ.+
35 Ọ gaghị anara ihe ọ bụla a chọrọ iji tie ya aka n’obi.
Obi agaghị ajụrụ ya, n’agbanyeghị otú onyinye a chọrọ inye ya bururu n’ibu.