5 “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị ọhụrụ, ọ gaghị eso ndị agha gaa agha. A gaghịkwa ekenye ya ọrụ ọ bụla ọzọ. A gaghị ekenye ya ọrụ ọ bụla ruo otu afọ. Ọ ga-anọ n’ụlọ na-eme nwunye ya obi ụtọ.+
9 Ka gị na nwunye gị ị hụrụ n’anya+ kporie ndụ n’ụbọchị niile na-enweghị isi Chineke mere ka ị dị ndụ n’ụwa,* bụ́ ụbọchị niile na-enweghị isi ị dị ndụ, n’ihi na ọ bụ ihe i ketara ná ndụ, bụrụkwa ụgwọ ọrụ gị maka ọrụ ị na-arụsi ike n’ụwa.*+