Abụ Ọma 26:2 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 Jehova, biko, nyochaa m, nwaleekwa m. Nụchaa obi m na ihe m na-eche n’ala ala obi m.*+ Ilu 21:2 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 Ihe niile mmadụ na-eme na-adị mma n’anya ya,*+Ma Jehova na-enyocha obi.*+ Ilu 24:12 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 12 Ma ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe a,”Ọ̀ bụ na Onye na-enyocha obi amaghị ihe dị gị n’obi?+ N’eziokwu, Onye na-ahụ gị ga-ama,Ọ ga-akwụkwa onye ọ bụla ụgwọ ọrụ ya.+
12 Ma ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe a,”Ọ̀ bụ na Onye na-enyocha obi amaghị ihe dị gị n’obi?+ N’eziokwu, Onye na-ahụ gị ga-ama,Ọ ga-akwụkwa onye ọ bụla ụgwọ ọrụ ya.+