-
1 Ndị Eze 3:7-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Jehova bụ́ Chineke m, i meela mụnwa bụ́ ohu gị eze, ka m nọchie Devid nna m, n’agbanyeghị na m ka bụ nwata, o nweghịkwa ihe m ma.*+ 8 Ohu gị so ná ndị gị ị họọrọ,+ ndị a na-enweghị ike ịgụta ọnụ maka na ha karịrị akarị. 9 Biko, nyere ohu gị aka ka o jiri obi ya niile na-erubere gị isi, ka o nwee ike ịna-ekpe ndị gị ikpe,+ na-amata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ,+ n’ihi na ònye ga-ekpeli ndị gị a dị ọtụtụ* ikpe ma ọ bụrụ na i nyereghị ya aka?”
-