-
2 Samuel 19:25-27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 Mgbe ọ bịara izute eze na Jeruselem,* eze jụrụ ya, sị: “Mefiboshet, gịnị mere na i soghị m gbapụ?” 26 Ya asị: “Onyenwe m eze, ị manụ na ohu gị dara ngwọrọ.+ M gwara onye na-ejere m ozi ka o dokwasịrị m ihe m ji anọkwasị n’elu jakị m ka m gbara ya soro eze gbapụ. Ma ọ ghọgburu m.+ 27 Ọ bịara n’ihu gị onyenwe m eze, ghagide mụnwa bụ́ ohu gị ụgha.+ Ma, onyenwe m eze dị ka mmụọ ozi nke ezi Chineke. N’ihi ya, mee ihe dị mma n’anya gị.
-