37 Banabas chọrọ ka ha kpọrọ Jọn, onye a na-akpọkwa Mak, gawa.+ 38 Ma Pọl chere na o kwesịghị isoro ha, ebe ọ bụ na ọ hapụrụ ha na Pamfilia, o soghịkwa ha gaa kwusaa ozi ọma.+ 39 Ha abụọ wee see ezigbo okwu, nke mere na ha kewara. Banabas+ wee kpọrọ Mak, ha abanye ụgbọ mmiri gawa Saịprọs.