4Nwunye otu n’ime ụmụ ndị amụma+ gwara Ịlaịsha, sị: “Di m bụ́ ohu gị anwụọla. O dokwara gị anya na ọ na-atụ egwu Jehova+ mgbe ọ nọ ndụ. Ma ugbu a, onye anyị ji ụgwọ abịala ka ọ kpọrọ ụmụ m abụọ ka ha gbawara ya ohu.”
25 Ma ebe ọ bụ na o nweghị otú ọ ga-esi akwụ ya, nna ya ukwu nyere iwu ka e ree ya na nwunye ya na ụmụ ya na ihe niile o nwere ka e wee kwụọ ụgwọ ahụ.+