16 n’ihi na ihe niile dị n’ụwa, ya bụ, ihe na-agụ anụ ahụ́ agụụ+ na ihe na-agụ anya agụụ+ na mmadụ igosi ihe ndị o nwere, esighị n’ebe Nna anyị nọ, kama o si n’ụwa. 17 Ụwa na-agafe agafe, ya na ihe na-agụ ya agụụ,+ ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.+