-
Luk 14:8-10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 “Mgbe mmadụ kpọrọ gị oriri agbamakwụkwọ, agala nọdụ ebe kacha mma.+ O nwere ike ịbụ na e nwere onye a na-akwanyere ùgwù karịa gị ọ kpọkwara. 9 Onye ahụ kpọrọ unu oriri ga-abịa sị gị, ‘Ka onye a nọrọ ebe ahụ ị nọ.’ Ị ga-ejizi ihere bilie gaa nọrọ ebe kacha ala. 10 Kama, mgbe a kpọrọ gị oriri, gaa nọdụ n’ebe kacha ala, ka ọ ga-abụ na mgbe onye ahụ kpọrọ gị bịara, ọ ga-asị gị, ‘Enyi m, gaa nọdụ n’ebe ka elu.’ Ị ga-enwezi ùgwù n’anya ndị ọbịa ibe gị niile.+
-