-
Jenesis 37:9-11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Mgbe e mechara, ọ rọrọ nrọ ọzọ ma kọọrọ ya ụmụnne ya, sị: “Arọrọ m nrọ ọzọ. Ná nrọ a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu nọ na-akpọrọ m isiala.”+ 10 O wee kọọrọ nna ya nrọ a, kọọkwara ya ụmụnne ya. Nna ya baara ya mba, sị ya: “Gịnị ka nrọ a ị rọrọ pụtara? Ị̀ na-ekwu na mụ na nne gị na ụmụnne gị ga-abịa kpọọrọ gị isiala?” 11 Ụmụnne ya wee nwewere ya anyaụfụ,+ ma nna ya buuru ihe ahụ o kwuru n’obi.
-