8 Jehova wee sị Setan: “Ì leruola ohu m Job anya? Ị̀ hụla na e nweghị onye dị ka ya n’ụwa? Ọ bụ onye ezi omume nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.+ Ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.” 9 Setan wee sị Jehova: “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke?+