2 Ihe E Mere 6:36 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 36 “Ọ bụrụ na ha emehie gị (n’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-anaghị eme mmehie),+ gị ewesa ha ezigbo iwe, nyefeekwa ha n’aka ndị iro, ndị meriri ha adọrọkwa ha n’agha laa ebe dị nso ma ọ bụ ebe dị anya,+ Abụ Ọma 51:5 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 5 Lee, m bu mmehie pụta ụwa. Abụ m onye mmehie malite mgbe nne m dị ime m.+ Ndị Rom 3:23 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 23 N’ihi na mmadụ niile emehiela, ha anaghịkwa akpa àgwà na-eme ka ebube Chineke pụta ìhè.+ 1 Jọn 1:8 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 Ọ bụrụ na anyị asị, “Anyị anaghị eme mmehie,” anyị na-aghọgbu onwe anyị,+ eziokwu adịghịkwa anyị n’ime.
36 “Ọ bụrụ na ha emehie gị (n’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-anaghị eme mmehie),+ gị ewesa ha ezigbo iwe, nyefeekwa ha n’aka ndị iro, ndị meriri ha adọrọkwa ha n’agha laa ebe dị nso ma ọ bụ ebe dị anya,+
8 Ọ bụrụ na anyị asị, “Anyị anaghị eme mmehie,” anyị na-aghọgbu onwe anyị,+ eziokwu adịghịkwa anyị n’ime.