22 Nri a na-eri n’ezinụlọ Solomọn kwa ụbọchị bụ ntụ ọka e gwere nke ọma dị kọọ iri atọ, ntụ ọka nkịtị dị kọọ iri isii, 23 ehi iri gbara agba, ehi iri abụọ ndị e si ebe ha na-ata ahịhịa kpụta, otu narị (100) atụrụ, ele, mgbada, mmoro, na obu ndị gbara agba.