-
1 Ndị Eze 5:8, 9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 Haịram gwakwara Solomọn, sị: “Anụla m ozi i ziri m. M ga-eme ihe niile ị chọrọ gbasara osisi sida na osisi junipa.+ 9 Ndị na-ejere m ozi ga-esi na Lebanọn buga ha n’oké osimiri. M ga-ahụkwa na e kere ha n’ùkwù n’ùkwù si n’oké osimiri buga ha ebe ị chọrọ ka m buga ha. M ga-atọsakwa ha ebe ahụ, gị eburuzie ha. Ụgwọ ị ga-akwụ m bụ inye ezinụlọ m ihe m ga-agwa gị ha ga-eri.”+
-