33 “Nụrụnụ ihe atụ ọzọ: E nwere otu nwoke nwere ala, kọọ ubi vaịn na ya,+ gbaakwa ya ogige ma gwuo ebe a na-azọchapụta mmanya na ya, rụọkwa ụlọ elu na ya.+ O nyefeziri ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gaa mba ọzọ.+
12Jizọs malitere imere ha ihe atụ. Ọ sịrị: “Otu nwoke kọrọ ubi vaịn,+ gbaa ya ogige gburugburu, gwuo olulu ebe mmanya si n’ebe a na-azọchapụta mmanya ga na-asọba ma rụọ ụlọ elu.+ O nyefeziri ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gawa mba ọzọ.+