-
Jeremaya 21:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
21 Jehova gwara Jeremaya okwu mgbe Eze Zedekaya+ ziri Pash-họ+ nwa Malkaịja na Zefanaya+ nwa Measaya, bụ́ onye nchụàjà, ka ha gakwuru ya ma rịọ ya, sị: 2 “Biko, jụọrọ anyị Jehova ase, n’ihi na Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn na-achọ ịlụso anyị agha.+ Ikekwe, Jehova ga-arụrụ anyị otu n’ime ọrụ ya dị ebube, nke ga-eme ka Nebukadneza hapụ anyị.”+
-