8 E nwere ihe Jehova gwara Jeremaya mgbe Eze Zedekaya na ndị niile nọ na Jeruselem gbachara ndụ ka a hapụ ndị ohu ka ha nwere onwe ha.+ 9 Ha gbara ndụ ka onye ọ bụla hapụ ohu ya, bụ́ onye Hibru, ka ọ laa, ma ohu ya nwoke ma ohu ya nwaanyị, ka onye ọ bụla ghara iji onye Juu ibe ya mere ohu.