-
Aịzaya 59:7, 8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Ha* na-agba ọsọ aga ime ihe ọjọọ.
Ha na-emekwa ngwa ngwa ka ha gbuo ndị aka ha dị ọcha.+
Ihe niile ha na-eche bụ echiche ọjọọ.
Ha na-emebisị ihe ndị mmadụ ma na-echi ha ọnụ n’ala.+
8 Ha amaghị otú ha na ndị ọzọ ga-esi na-adị n’udo.
Ha anaghị ekpe ikpe ziri ezi.+
Ha na-eme ka okporo ụzọ ha niile gbagọọ agbagọ.
Udo agaghị adịrị onye ọ bụla na-eje ije na ha.+
-
-
Jeremaya 35:15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Anọ m na-ezitere unu ndị ohu m niile, bụ́ ndị amụma. M na-ezite ha ugboro ugboro,*+ ha ana-asị unu, ‘Biko, ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme,+ mewe ihe ọma. Unu esokwala chi ọzọ dị iche iche, unu efekwala ha ofufe, ka unu wee biri n’ala m nyere unu na nna nna unu hà.’+ Ma unu atọghị ntị n’ala. Unu egeghịkwa m ntị.
-