36 ‘Ọ bụ ya mere obi m ga-eji na-eme mkpọtụ ka ọjà n’ihi Moab.+
Obi m ga na-adakwa ka ọjà n’ihi ndị Kia-hires.
Ọ bụ ya mere akụnụba ya ga-eji laa n’iyi.
37 N’ihi na isi ha niile akwọchaala.+
A kpụkwara afụ ọnụ ha niile akpụ.
Aka ha niile bucha ọnyá.+
Ha kekwara ákwà iru uju n’úkwù.’”+