-
2 Ndị Eze 25:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Ndị Kaldia mechara kwatuo mgbidi Jeruselem.+ Ka ha gbakwara obodo ahụ gburugburu ịlụso ya agha, ndị agha niile nọ na ya ji abalị si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’agbata mgbidi abụọ gbaa ọsọ. Ọnụ ụzọ ámá ahụ dị n’akụkụ ubi eze. Eze gbakwaara tinye isi n’ụzọ gara Araba.+ 5 Ma ndị agha Kaldia chụwara ya, chụkwute ya n’ọzara Jeriko. Ndị agha ya niile hapụkwara ya rie mbọmbọ.
-