8 M ga-ebe ákwá arịrị, tiekwa mkpu ákwá n’ihi ihe a.+
M ga-agba ụkwụ efu, gbarakwa ọtọ na-ejegharị.+
M ga na-eti mkpu dị ka nkịta ọhịa,
Na-erukwa uju dị ka enyí nnụnụ.
9 N’ihi na ọnyá ya enweghị ike ịla ala.+
Ọnyá ahụ erutela Juda.+
O rutela n’ọnụ ụzọ ámá ndị m, rutekwa Jeruselem.+