37 Ma Elayakim nwa Hilkaya, onye na-elekọta ezinụlọ* eze, Shebna bụ́ odeakwụkwọ, na Joa nwa Esaf, bụ́ onye na-edekọ ihe, dọwara uwe ha ma bịakwute Hezekaya, gwa ya ihe Rabshake kwuru.
2 Ọ gwaziri Elayakim, bụ́ onye na-elekọta ezinụlọ* ya, Shebna bụ́ odeakwụkwọ, na ndị okenye bụ́ ndị nchụàjà, ka ha gakwuru Aịzaya onye amụma+ bụ́ nwa Emọz. Ha niile ji ákwà iru uju kpuchie onwe ha.