9 Ihe o dere n’akwụkwọ ozi ndị ahụ bụ: “Wepụtanụ otu ụbọchị unu ga-ebu ọnụ, kọsaakwanụ ya, gwakwanụ Nebọt ka ọ nọrọ n’isi oche. 10 Gwakwanụ ụmụ nwoke abụọ na-abaghị uru ka ha nọrọ n’ihu ya bo ya ebubo+ na ọ bụrụ Chineke na eze ọnụ.+ Kpọpụtazienụ ya n’azụ obodo ma jiri nkume tụgbuo ya.”+