23 Ọ ga-emekwa ka mmiri zoo n’oge unu kụrụ mkpụrụ n’ala.+ Nri ala a ga-emepụta ga-adị mma, hiekwa nne.+ N’oge ahụ, anụ ụlọ unu ga-ata ahịhịa ná nnukwu ala ahịhịa juru.+ 24 Ehi na jakị ndị e ji akọ ubi ga-ata ahịhịa dị mma, nke e ji shọvel na fọk wepụsịa ihe ndị na-adịghị mma na ya.