-
Diuterọnọmi 4:25, 26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 “Ọ bụrụ na unu amụọ ụmụ, mụtakwa ụmụ ụmụ, ọ bụrụkwa na unu ebie ogologo oge n’ala ahụ ma mee omume ọjọọ, meekwa ụdị arụsị ọ bụla a pịrị apị+ ma mee ihe dị njọ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu ka unu kpasuo ya iwe,+ 26 eluigwe na ụwa bụụrụ m ndị akaebe taa na a ga-ebibirịrị unu ngwa ngwa n’ala ahụ unu na-agafe Osimiri Jọdan ka unu weghara. Unu agaghị ebite aka na ya, kama a ga-ala unu n’iyi kpamkpam.+
-