-
Matiu 9:28-30Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
28 Mgbe Jizọs banyere n’ime ụlọ, ndị ìsì ahụ bịakwutere ya, o wee jụọ ha, sị: “Ùnu nwere okwukwe na m ga-emeli ihe a?”+ Ha asị ya: “Ee, Onyenwe anyị.” 29 O wee bitụ ha aka n’anya,+ sị: “Ka e meere unu ihe unu rịọrọ n’ihi na unu nwere okwukwe.” 30 Anya ha wee meghee. Jizọs gwasikwara ha ike, sị: “Ya enwekwala onye unu ga-akọrọ ya.”+
-