-
Mak 7:32-35Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
32 N’ebe a,* ha kpọtaara ya otu nwoke ntị chiri, nke ọ na-esikwara ike ikwu okwu.+ Ha rịọrọ ya ka ọ gwọọ ya.* 33 O wee kpọpụ ya n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ ma rụnye mkpịsị aka ya n’ime ntị abụọ nwoke ahụ. Ọ gbụpụkwara asọ mmiri, metụ nwoke ahụ aka n’ire.+ 34 O leliziri anya n’eluigwe, kuda ume ma sị ya: “Efata,” ya bụ, “Meghee.” 35 Ntị ya wee meghee,+ nsogbu ọ na-enwe n’ikwu okwu lakwara. O wee malite ikwu okwu nke ọma.
-