30 Unu ekwekwala ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Jehova obi mgbe ọ na-agwa unu, sị: “Jehova ga-anapụtarịrị anyị. A gaghịkwa enyefe obodo a n’aka eze Asiria.”+
12 “Jehova rụchaa ọrụ niile ọ na-arụ n’Ugwu Zayọn nakwa na Jeruselem, ọ ga-ata eze Asiria ahụhụ maka na ọ dị mpako, onwe ya na-ebukwa ya isi.+13 Ọ sịkwara,
‘Ọ bụ ike m
Na amamihe m ka m ga-eji eme ihe a, n’ihi na ama m ihe.