15 “Ma ọ bụrụ na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya na-edebe iwu ya niile, na-emekwa ihe ndị o kpebiri bụ́ ndị m na-agwa unu taa, a ga-abụrịrị unu ọnụ, ihe ọjọọ a niile ga-emekwa unu:+
16 Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu ka unu ghara imebi, ọ bụrụkwa na unu agaa fee chi ọzọ dị iche iche ma kpọọrọ ha isiala, Jehova ga-ewesa unu ezigbo iwe.+ Unu ga-alakwa n’iyi ngwa ngwa n’ọmarịcha ala a o nyere unu.”+