27 Jehova sịrị: “M ga-ewepụ Juda n’ihu m,+ otú m wepụrụ Izrel.+ M ga-ajụkwa Jeruselem, bụ́ obodo m họọrọ. M ga-ajụkwa ụlọ ahụ m kwuru gbasara ya, sị, ‘Aha m ga-adịgide na ya.’”+
3 Ihe a mere ndị Juda maka na Jehova kwuru na ọ ga-eme ha. Ọ chọrọ iwepụ ha n’ihu ya+ n’ihi mmehie niile Manase mere,+4 nakwa n’ihi ndị aka ha dị ọcha o gburu.*+ O gburu ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha na Jeruselem. Jehova achọghịkwa ịgbaghara ndị Juda n’ihi ya.+