6 Ndị Kaldia jidere ya,+ kpụrụ ya kpụgara eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla. Ha makwara ya ikpe. 7 Ha gburu ụmụ ya ndị nwoke n’ihu ya. Nebukadneza rụkpọsịkwara Zedekaya anya, tụọ ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee, kpụrụkwa ya laa Babịlọn.+
13 M ga-eji ụgbụ m ji achụ nta kpuchie ya, jirikwa ya jide ya.+ M ga-akpụrụ ya bịa Babịlọn, bụ́ ala ndị Kaldia, ma ọ gaghị ahụ ala ahụ. Ọ ga-anwụkwa ebe ahụ.+