9 Ọ gbara ụlọ niile dị na Jeruselem ọkụ,+ ma ụlọ Jehova+ ma ụlọ* eze+ ma ụlọ onye ọ bụla a ma ama.+10 Ndị agha Kaldia niile ha na onyeisi ndị nche+ ahụ so bịa kwaturu mgbidi gbara Jeruselem gburugburu.
29 Ndị Kaldia, ndị nọ na-alụso obodo a agha, ga-abata mụnye ya ọkụ, ya agbaa ọkụ.+ Ebe ndị ọzọ ha ga-agba ọkụ bụ ụlọ ndị obodo a na-anọ n’elu ha achụrụ Bel àjà, na-achụkwara chi ọzọ dị iche iche àjà mmanya. Àjà ndị a ha na-achụ na-akpasu m iwe.’+