11 Ndị nchụàjà na ndị amụma wee gwa ndị isi ahụ na mmadụ niile, sị: “E kwesịrị igbu nwoke a,+ n’ihi na o buru amụma ihe ga-eme obodo a. Unu jikwa ntị unu nụ ya.”+
4 Ndị isi wee gwa eze, sị: “Biko, ka e gbuo nwoke a,+ n’ihi na o ji ihe ndị a ọ na-ekwu na-akụda ndị agha fọdụrụ n’obodo a na mmadụ niile aka. N’ihi na ọ chọghị ka udo dịrị ha, kama ọ chọrọ ka ọdachi dakwasị ha.”