-
Jeremaya 21:7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 “‘Jehova kwuru, sị, “Nke a gachaa, m ga-akpọrọ Zedekaya bụ́ eze Juda na ndị na-ejere ya ozi na ndị obodo a, ndị nke ọrịa na-efe efe na mma agha na ụnwụ gbufọrọ, nyefee n’aka Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn nakwa n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ igbu ha.*+ Nebukadneza ga-ejikwa mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere. Ọ gaghịkwa enwere ha ọmịiko ma ọ bụ metere ha ebere.”’+
-
-
Ezikiel 12:12, 13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Onyeisi ha ga-eburu ngwongwo ya n’ubu pụọ mgbe ọchịchịrị gbara. Ọ ga-akpọpu ahụ́ ụlọ ya ma si na ya buru ngwongwo ya pụọ.+ Ọ ga-ekpuchi ihu ya ka ọ ghara ịhụ ala. 13 M ga-eji ụgbụ m ji achụ nta kpuchie ya, jirikwa ya jide ya.+ M ga-akpụrụ ya bịa Babịlọn, bụ́ ala ndị Kaldia, ma ọ gaghị ahụ ala ahụ. Ọ ga-anwụkwa ebe ahụ.+
-