-
1 Ndị Eze 16:23, 24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
23 N’afọ nke iri atọ na otu n’ọchịchị Esa eze Juda, Ọmraị malitere ịchị Izrel. Ọ chịkwara afọ iri na abụọ. Ọ nọ na Teza chịa afọ isii. 24 O ji talent* ọlaọcha abụọ zụrụ ugwu Sameria n’aka Shima, rụọkwa obodo na ya. Ọ gụrụ obodo ahụ ọ rụrụ Sameria.*+ O si n’aha Shima, onye nwebu ugwu ahụ, nweta aha ahụ.
-