-
Diuterọnọmi 13:6-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 “Ọ bụrụ na nwanne gị nwoke, nwa nwoke nne gị mụrụ, ma ọ bụ nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị ma ọ bụ nwunye gị ị hụrụ n’anya ma ọ bụ ezigbote enyi gị anwaa ịrafu gị na nzuzo, sị, ‘Ka anyị gaa fee chi ọzọ,’+ chi ndị gịnwa ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị 7 n’ime chi dị iche iche ndị niile gbara unu gburugburu na-efe, ma ọ̀ bụ nke ndị bi unu nso ma ọ̀ bụ nke ndị bi unu n’ebe dị anya, malite n’otu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ ya nke ọzọ, 8 ekwetala ihe o kwuru. Egela ya ntị.+ Emerela ya ebere ma ọ bụ nweere ya ọmịiko, echebekwala ya. 9 Kama, unu ga-egburịrị ya.+ Ọ bụ gị ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume, ndị Izrel niile esorozie gị tụọ ya nkume.+
-