-
Jeremaya 36:22-24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 Ihe a na-eme n’ọnwa nke itoolu,* eze nọkwa ọdụ n’ụlọ ọ na-anọ n’oge oyi, na-anya ọkụ a kwanyere n’ite ọkụ dị ebe ahụ. 23 Mgbe ọ bụla Jehudaị gụrụ nkebi atọ ma ọ bụ anọ n’akwụkwọ ahụ, eze ejiri mma odeakwụkwọ chabie ya ma tụba ya n’ọkụ na-enwu n’ite ọkụ ahụ. O megidere ihe a ruo mgbe ọkụ ahụ rechapụrụ akwụkwọ mpịakọta ahụ niile. 24 Ha atụghị ụjọ ọ bụla. Ma eze ma ndị niile na-ejere ya ozi, bụ́ ndị nụrụ okwu a niile, adọwaghị uwe ha.
-