10 I zochaa ya, gwazie ha, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “M ga-akpọ Nebukadneza* eze Babịlọn, bụ́ ohu m.+ M ga-adọsa ocheeze ya n’elu nkume ndị a m zoro. Ọ ga-amakwa ụlọikwuu ya n’elu ha.+
19 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘M ga-enye Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn ala Ijipt.+ Ọ ga-eburu akụ̀ ndị dị na ya, kwakọrọkwa ọtụtụ ihe na ya. Ihe ndị a ga-adịzi ka ihe e ji kwụọ ndị agha ya ụgwọ.’