4 Anụkwara m ka olu ọzọ si n’eluigwe sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta,+ ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya mehie, ọ bụrụkwa na unu achọghị ka a taa unu ahụhụ a ga-ata ya.+ 5 Mmehie ya karịrị akarị,+ Chineke ga-ekpekwa ya ikpe maka ihe ọjọọ ndị o mere.+