Abụ Ọma 17:5 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 5 Nyere m aka ka m na-aga n’ụzọ gị,Ka m* ghara ịda.+ Abụ Ọma 37:23 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 23 Ọ bụrụ na ihe mmadụ na-eme dị Jehova mma,+Ọ ga na-eduzi onye ahụ n’ihe ọ bụla ọ na-eme.+ Ilu 16:3 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 3 Tinye ihe ọ bụla ị na-eme n’aka Jehova,+Ihe ndị ị chọrọ ime ga-agakwa nke ọma. Ilu 20:24 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 24 Ọ bụ Jehova na-eduzi nzọụkwụ mmadụ.+ Ndị mmadụ hà ga-aghọtali ụzọ ha?*