34 M ga-eme ka ha kwụsị iti mkpu ọṅụ na mkpu ndị obi dị ụtọ ha na-eti n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem. M ga-emekwa ka a ghara ịnụ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ.+ Ala a ga-abụzi ala e bibiri ebibi.’”+
23 Ọkụ* agaghịkwa enwu n’ime gị ọzọ. A gaghịkwa anụ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na nke nwaanyị a na-alụ ọhụrụ n’ime gị ọzọ. N’ihi na ndị ahịa gị bụ ndị nọ n’ọkwá ukwu n’ụwa. I jikwa mgbaasị ị na-eme+ duhie mba niile.