-
2 Ndị Eze 24:11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Nebukadneza eze Babịlọn bịakwara Jeruselem n’oge ahụ ndị agha ya nọchibidoro ya.
-
-
2 Ndị Eze 25:13-15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Ndị Kaldia kụrisịrị ogidi ọla kọpa+ ndị dị n’ụlọ Jehova, gbukasịakwa ihe ndị e ji ebu ihe+ dị n’ụlọ Jehova nakwa otu nnukwu ite e ji ọla kọpa rụọ a na-akpọ Oké Osimiri.+ Ha bukwaara ọla kọpa e ji rụọ ihe ndị a laa Babịlọn.+ 14 Ha bukọkwaara ite, shọvel, ihe ndị e ji emenyụ ọkụ, iko, na arịa niile e ji ọla kọpa rụọ, ndị e ji arụ ọrụ n’ụlọ nsọ. 15 Onyeisi ndị nche ahụ bukọkwaara ihe ndị e ji agụrụ ọkụ na ọkwá ndị e ji ezigbo ọlaedo+ na ezigbo ọlaọcha rụọ.+
-