19 M ga-akpọghachite Izrel n’ala ya ebe anụmanụ na-ata ahịhịa.+ Izrel ga-atakwa ahịhịa n’ugwu Kamel nakwa na Beshan.+ Afọ ga-ejukwa ya* n’ugwu ndị dị n’Ifrem+ nakwa n’ugwu ndị dị na Gilied.’”+
14 M ga-azụ ha n’ebe dị mma anụmanụ na-ata ahịhịa. Ha ga na-atakwa ahịhịa n’ugwu ndị dị n’Izrel.+ N’ebe ahụ dị mma ahịhịa juru ka ha ga-amakpu.+ Ha ga-atakwa ahịhịa n’ebe dị ezigbo mma anụmanụ na-ata ahịhịa n’ugwu ndị dị n’Izrel.”