9 “‘“‘N’ihi ya, unu egela ndị amụma unu ntị, ha na ndị na-agbara unu afa na ndị na-akọwara unu nrọ na ndị na-emere unu anwansi* nakwa ndị dibịa afa unu, bụ́ ndị na-agwa unu, sị: “Unu agaghị ejere eze Babịlọn ozi.”
8 Mụnwa bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “Unu ekwela ka ndị amụma unu na ndị na-agbara unu afa duhie unu.+ Unu egekwala ntị ná nrọ ndị ha na-akọrọ unu na ha rọrọ.