-
Jeremaya 25:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Jehova nọkwa na-ezitere unu ndị ohu ya niile, bụ́ ndị amụma, ugboro ugboro,* ma unu anaghị ege ha ntị. Unu anaghịkwa atọ ntị n’ala ịnụ ihe ha na-agwa unu.+ 5 Ha na-asị, ‘Biko, ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ ụzọ ọjọọ ya na omume ọjọọ ya,+ ka unu wee bitee aka n’ala Jehova nyere unu na nna nna unu hà kemgbe ọtụtụ afọ.
-