-
Ezikiel 13:2, 3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma ihe ga-eme ndị amụma nọ n’Izrel,+ gwakwa ndị na-eji aka ha echepụta ihe ha na-ebu n’amụma* okwu.+ Sị ha, ‘Nụrụnụ ihe Jehova kwuru. 3 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ndị amụma iberiibe ga-ata ahụhụ, ndị na-ebu ihe dị ha n’obi n’amụma, mgbe ha na-ahụghị ọhụụ ọ bụla.+
-