14 Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma ahụ na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha. Enyeghị m ha iwu. Agwaghịkwa m ha okwu.+ Ha na-ahụ ọhụụ ụgha. Ihe ha na-agwa unu bụ ihe na-enweghị isi ha gbatara n’afa nakwa ihe ndị ha chepụtara n’onwe ha.+
8 Mụnwa bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “Unu ekwela ka ndị amụma unu na ndị na-agbara unu afa duhie unu.+ Unu egekwala ntị ná nrọ ndị ha na-akọrọ unu na ha rọrọ.