5 m leliri anya hụ otu onye yi uwe linin.+ O kekwara ájị̀ ọlaedo nke si Yufaz n’úkwù. 6 Ahụ́ ya na-egbuke egbuke ka nkume krisolaịt.+ Ihu ya na-enwu ka àmụ̀mà. Anya ya dị ka ọwa na-enwu ọkụ. Aka ya na ụkwụ ya yiri ọla kọpa na-egbuke egbuke,+ olu ya na-adasikwa ụda ike ka olu ìgwè mmadụ.