-
1 Ihe E Mere 9:26, 27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 E nwere ndị isi* anọ n’ime ndị na-eche ọnụ ụzọ ámá nche, ndị e nyere ọrụ a na-enye ndị a tụkwasịrị obi. Ha bụ ndị Livaị. Ha na-ahụ maka ọnụ ụlọ ndị dị* n’ụlọ ezi Chineke nakwa akụ̀ ndị dị na ya.+ 27 Ha na-eche nche gburugburu ụlọ ezi Chineke chi abọọ. Ọ bụ ha na-ahụ maka iche nche, na-ahụkwa maka mkpịsị ugodi. Ọ bụkwa ha na-emeghe ụzọ n’ụtụtụ ọ bụla.
-