-
Ọnụ Ọgụgụ 28:11-15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 “‘Ná mbido ọnwa ọ bụla,* unu ga-eji oké ehi abụọ, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ,+ 12 nakwa ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka+ maka oké ehi nke ọ bụla, nakwa ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka maka otu ebule ahụ,+ 13 nakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka maka nwa ebule nke ọ bụla. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma*+ a na-esu ọkụ, àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova. 14 Àjà mmanya ha na ha ga-agakọ ga-abụ ọkara otu hin mmanya maka otu oké ehi+ na otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu hin maka ebule ahụ+ nakwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin maka otu nwa ebule.+ Ọ bụ ya bụ àjà a na-esu ọkụ a ga na-achụ kwa ọnwa n’afọ. 15 A ga na-achụkwara Jehova otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ma e wepụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà mmanya ya na ya na-agakọ.
-